Saturday, November 12, 2016

Otito

N'oge mbu...a maghi m ebe ndu m na aga.  N'oge mbu a maghi m Chineke ofuma ofuma. Ma na mgbe m choputara iru Chineke...Jesus we bulie m elu, we hichapu anya mmiri n'anya m, we me ka ahu m di ike, mepe anya m na obi m. Jesus di mma, O di ebube, di ngozi, O juru n'ebere. O nweghi ihe obula nwere Ike I me ya ka O bu iheobula abughi Chukwu. Onye kwesiri ka anyi tu kwa si obi. O gaghi a tu gi n'iru, hapu gi ebe ahu so onwe gi. N'ani Ya bu Chukwu. So aha Jesus bu aha ga azoputa anyi. Kpo ya mgbe niile. Mgbe o di ka olilo anya gi gwuru a gwu... O bu mgbe ahu ka O ga a malite maka gi. Jesus, I bu Agu na eche mba mgbe niile. I puo n'otutu, O na eche esinulo gi. N'eche umu gi, oru gi...ihe niile gbasara ndu gi. O di mms. Biko, Nye ya ekele. Ja ya mma ofuma. O bu ekele gi n'otutu a vu nke a ...Chi na azoputa m. Daalu nke oma Onye nwe m. I di amara, dikwa ebube. I buru ibu kacha ibu. Daalu Onye m huru n'anya, daalu Onye m buru n'obi. Daalu Onye na eche m, n'eche mba m. I meela nke oma. Olu Gi, ebere Gi, idimma Gi juru m n'anya. Daalu Chukwu. Buru otito n'ihi na o ruru Gi. R'iwe otito, I makwa ihe di mma. Buru ya, O bu ngi nwe ya. Gi nwe we da n'ala m. I di nnukwu mma.

No comments:

Post a Comment